UKPARA GBAKOTA AKA
From Wikipedia
Ndewo nu. Umunne m, bia ka anyi were otu obi na-eme ihe banyere anyi n'ihi na nna anyi ha kwuru "anyukoo mamiri ya agba ufufu", "Ukpara chikota ukwu ha agbawa ite". Biko nu ihe na-eme n'obodo a bu Nigeria na-agba anyi anya mmiri n'ihi na anyi ahujuola anyi. Leenunu onye dika Minista nke okwu-ego puru apu: Okonjo Iweala, onye meziri-okwu ego ala anyi mana lee ka ha si chupu ya n'ihi na okwuru ezi okwu, mana ihe ahu o kwuru o nweghi onye lebara ya anya. Anyi na-ekpe ekpere ka ha hara ime ihe ha ma eme site na ichupu ndi Igbo ndi nke ozo ahu no na ochichi ma ha mezichaa ihe. Bikonu ka anyi hie aka n'anya ma na eme ihe mgbe niile maka na onye ya na Ekwensu na-eriko nri na e ji ngaji ogolo eri nri. KA ONYENWEANYI MEZIE OKWU MA NONYERE ANYI.